4. O we gabiga n'ugwu Efraim, gabiga kwa n'ala Shalisha, ma ha achọtaghi ha: ha we gabiga n'ala Shaalim, ma ha adighi n'ebe ahu: o we gabiga n'ala Benjamin, ma ha achọtaghi ha.
5. Mb͕e ndi ahu batara n'ala Zuf, Sọl siri nwa-okorọbia-ya nke soro ya je, Bia, ka ayi laghachi; ka nnam we ghara igha iche uche bayere nne-inyinya-ibu-ya, we cheb͕u onwe-ya bayere ayi.
6. O we si ya, Biko, le, onye nke Chineke nọ n'obodo a, anāsọpuru kwa nwoke ahu; ihe nile ọ nēkwu aghaghi irè erè: ub͕u a ka ayi je n'ebe ahu; eleghi anya ọ gēgosi ayi uzọ-ayi nke ayi jeworo na ya.
7. Sọl we si nwa-okorọbia-ya, Ma, le, ọ buru na ayi eje, gini ka ayi gēji bakuru nwoke ahu? n'ihi na achicha alapuwo n'ihe-ayi, ọ dighi kwa onyinye iji bakuru onye nke Chineke: gini di n'aka-ayi?
8. Nwa-okorọbia ahu we za Sọl ọzọ, si, Le, achọtawo n'akam otù uzọ n'uzọ anọ nke shekel ọla-ọcha: m'gēnye kwa ya onye nke Chineke, ka o we gosi ayi uzọ-ayi.
9. (Na mb͕e gara aga n'Israel, otú a ka otu nwoke siri mb͕e o jere iju Chineke ase, Bianu, ka ayi jekuru onye-ọhu-uzọ: n'ihi na onye anākpọ Onye-amuma ta, anākpọ ya Onye-ọhu-uzọ na mb͕e gara aga).
10. Sọl we si nwa-okorọbia-ya, Okwu-gi di nma; bia, ka ayi je. Ha we je n'obodo ebe onye nke Chineke nọ.
11. Ka ndi ahu nārigo na nrigo obodo ahu, ha onwe-ha hutara umu-ab͕ọghọ ka ha nāputa isere miri, ha we si ha, Onye-ọhu-uzọ, ọ̀ nọ n'ebe a?
12. Ha we za ha, si, Ọ nọ, le, ọ nọ n'iru gi: me ngwa ub͕u a, n'ihi na ta ka ọ batara n'obodo; n'ihi na ndi Israel nwere àjà ta n'ebe di elu a:
13. mb͕e unu bara n'obodo, otú a ka unu gāchọta ya, tutu ọ rigorue ebe di elu iri ihe: n'ihi na ndi Israel agaghi-eri ihe rue mb͕e ọ biara, n'ihi na ya onwe-ya nāgọzi àjà-ha; emesia ndi akpọworo gēri ihe. Ma ub͕u a rigonu; n'ihi na ya onwe-ya, ub͕u a ka unu gāchọta ya.
14. Ha we rigorue obodo; ka ndi ahu nābà n'etiti obodo, le, Samuel nāputa izute ha, irigoru ebe di elu ahu.
15. Ma Jehova kpughepuru nti Samuel ka ọ nu ihe otù ubọchi tutu Sọl abia, si,
16. Dika mb͕e a echi M'gēzitere gi otù nwoke sitere n'ala Benjamin, i gēte kwa ya manu ibu onye-ndú ndim, bú Israel, ọ gāzọputa kwa ndim n'aka ndi Filistia: n'ihi na ahuwom ndim, n'ihi na iti-nkpu-ha abàwom na nti.