1. Ma ndi Filistia chikọtara ọmuma-ulo-ikwū-ha ibu agha, ewe chikọta ha na Soko, nke Juda nwe, ha we ma ulo-ikwū-ha n'etiti Soko na Azeka, n'Efes-damim.
2. Sọl na ndikom Israel we chikọta onwe-ha, ma ulo-ikwū-ha na ndagwurugwu Ila, we do agha n'usoro izute ndi Filistia.
3. Ndi Filistia we nēguzo n'ugwu n'otù akuku, Israel nēguzo kwa n'ugwu n'akuku nke-ọzọ: ndagwurugwu we di n'etiti ha.
4. Onye-nputa-ọb͕ọ-agha we si n'ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia puta, aha-ya bu Gọlaiat, sitere na Gat, ogologo-ya di cubit isi na otù ntù-aka.
5. Okpu-agha ọla di kwa n'isi-ya, ọ bu kwa uwe-agha emere dika akpirikpa-azù ka eyikwasiri ya; ọtùtù uwe-agha ahu di nnù shekel ọla iri-na-abua na ọgu iri.
6. Ihe-ọla eji kpuchi ukwu di kwa n'ukwu-ya abua, nkpunkpu ube ọla di kwa n'etiti ubu-ya abua.
7. Osisi ube-ya di kwa ka oké ókpòrò di arọ́ nke ọkpa-ákwà ji akpa ákwà; isi ube-ya di nnù shekel ígwè na ọgu iri: onye nēbu ọta-ya nēje n'iru ya.